Mark 13:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na ọtụtụ ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta ìhè nꞌoge ahụ. Ha ga-arụ ọrụ ebube ha ga-eji gbalịa ịghọgbu ndị Chineke họpụtara, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.
Igbo 2006
n'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche, ka ha we duhie ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha, ga-apụta ma rụọkwa ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị iche iche iji duhie ndị a họpụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.