Mark 13:27 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ ka m ga-ezipụ ndị mmụọ ozi m ka ha gaa kpọkọtaa ndị nile a họpụtara site nꞌakụkụ nile nke ụwa, site nꞌotu nsọtụ ruo na nsọtụ nke ọzọ.
Igbo 2006
Mb͕e ahu Ọ gēzipu kwa ndi-mọ-ozi-Ya, me ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site na nsọtu uwa rue nsọtu elu-igwe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe.