Mark 13:34 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ọbịbịa m ka a ga-eji tụnyere otu nwoke hapụrụ ụlọ ya gaa mba ọzọ. Tupu ọ pụọ, ọ kpọrọ ndị ọrụ ya nye ha ọrụ ha ga-arụ tupuu ọ lọta. Emesịa, ọ gwara onye na-eche ụlọ ya nche ka ọ na-ele anya nlọghachi ya.
Igbo 2006
Ọ di ka mb͕e madu, onye jere inọdu n'ala ndi ọzọ, ebe ọ rapuru ulo-ya, nye kwa ndi-orù-ya ọlu ichi-isi, nye onye ọ bula nime ha ọlu-ya, o nye-kwa-ra onye-ọnu-uzọ iwu ka ọ che nche.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche.