Mark 13:35 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere, unu onwe unu kwesịrị iche nche, nꞌihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nꞌanyasị, ma ọ bụ nꞌetiti abalị, ma ọ bụ mgbe ọkụkọ kwara akwa, ma ọ bụ nꞌụtụtụ.
Igbo 2006
Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi mb͕e Onye-nwe ulo gābia, ma ọ bu n'anyasi, ma-ọbu n'etiti abali, ma-ọbu mb͕e oke-ọkuku kwara, ma-ọbu n'ututu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ya mere nọrọnụ na nche, nʼihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nʼuhuruchi maọbụ nʼetiti abalị. Maọbụ mgbe ọkụkụ kwara akwa, maọbụ nʼisi ụtụtụ.