Mark 13:8 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Mba ga-ebili lụso mba ọsọ agha. Alaeze ga-ebilikwa buso alaeze ọzọ agha. A ga-enwe ala ọma jijiji nꞌọtụtụ obodo dị iche iche. Ụnwụ ga-adịkwa. Ma ihe ndị a nile bụ nanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa nꞌoge dị nꞌihu.
Igbo 2006
N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: ala-ọma-jijiji gādi n'ebe di iche iche; oké unwu di iche iche gādi: ihe ndia bu nmalite ihe-nb͕u.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mba ga-ebili megide mba ibe ya. Alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ibe ya. Ala ọma jijiji na ụnwụ ga-adị nʼebe dị iche iche. Ihe ndị a bụ mmalite nke oke ihe mgbu.