Mark 13:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma mgbe ihe ndị a na-eme, lezienụ anya! A ga-akpụrụ unu gaa nꞌụlọ ikpe, tiekwa unu ihe nꞌụlọ ekpere dị iche iche. Nꞌihi m kwa, a ga-agbara unu akwụkwọ nꞌihu ndị eze na nꞌihu ndị na-achị achị. Oge a bụkwa oge unu ga-eji gwa ha ozi ọma ahụ.
Igbo 2006
Ma unu onwe-unu lezie anya n'onwe-unu: n'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche; n'ulo-nzukọ di iche iche ka agāpia kwa unu ihe; n'iru ndi-isi na ndi-eze ka unu gēguzo kwa n'ihim, iburu ha àmà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Unu aghaghị ịbụ ndị nọ na nche. A ga-enyefe unu nʼaka ndị na-achị achị, pịakwa unu ihe nʼụlọ ekpere. Nʼihi m, unu ga-eguzo nʼihu ndịisi ọchịchị na ndị eze dị ka ndị ama nye ha.