Mark 14:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụbọchị mbụ nke mmemme ngabiga, mgbe ndị Juu na-egbu atụrụ ha ji achụ aja ngabiga ahụ, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa doziere gị ihe, maka iri ori ngabiga?”
Igbo 2006
N'ubọchi mbu nke achicha ekoghi-eko, mb͕e ha nāchu aja ngabiga, ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Òle ebe I nāchọ ka ayi je dozie ka I we rie oriri ngabiga?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụbọchị mbụ nke Mmemme achịcha na-ekoghị eko, mgbe ha na-achụ aja atụrụ ngabiga, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe, maka oriri ngabiga?”