Mark 14:41 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ hapụkwara ha gaa kpeekwa ekpere ọzọ. Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ gwara ha sị, “Ùnu nọrịrị na-arahụ ụra ma na-ezukwa ike? O zuola! Bilienụ! Oge ịrahụ ụra agafeela! Lee! A rarala mụ bụ Nwa nke mmadụ nye nꞌaka ndị mmadụ ọjọọ.
Igbo 2006
O we bia ọbibia nke-atọ, si ha, Nārarunu ura site n'ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: o zuwo: oge hour nkem eruwo; le, anārara Nwa nke madu nye n'aka ndi-nmehie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra na-ezukwa ike? O zuola! Oge awa ahụ abịala. Lee, a rarala Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmehie.