Mark 14:43 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ọ kpụ okwu a nꞌọnụ, lee Judas, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya bịara. Ya na igwe mmadụ so. Ụfọdụ nꞌime ha ji mma, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zitere ha ijide Jisọs.
Igbo 2006
Ngwa ngwa, mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, biara, ya na ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ batara, ya na igwe mmadụ, ndị ji mma agha na mkpọ. Ọ bụ ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu, na ndị ode akwụkwọ, na ndị okenye ndị Juu zitere ha.