Mark 14:63 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe onyeisi nchụaja nụrụ okwu a Jisọs kwuru, ọ dọwara uwe ya nꞌiwe, tie mkpu sị, “Gịnị ọzọ ka anyị na-achọ? Ọ bara uru ịchọkwa ndị ọzọ ga-agbagide ya ama?
Igbo 2006
Onye-isi-nchu-àjà we dọwa uwe-ya nile, si, Ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onyeisi nchụaja dọwara uwe ya kwuo sị, “Gịnị mere anyị ji achọ ndị akaebe ọzọ?