Mark 14:65 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ ụfọdụ nꞌime ha bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri. Ndị ọzọ jiri akwa kechie anya ya, bido jiri aka ha na-eti ya ihe. Mgbe ha na-eti ya ihe, ha na-agwa ya sị, “Onye amụma, gwa anyị, ònye tiri gị ihe?” Ọ bụladị ndị nche nọ nꞌebe ahụ kpụpụtara ya nꞌezi na-eti ya ihe.
Igbo 2006
Ufọdu we malite ibusa Ya ọnu-miri, na ikechi iru-Ya, na iti Ya aka, na isi Ya, Bu amuma: ndi nēje ozi we nara Ya n'ipia Ya ihe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ ụfọdụ bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri asọ, jiri akwa kechie ya anya, tiekwa ya aka na-asị, “Buo amụma!” Ndị nche kpụpụtara ya tiekwa ya ihe.