Mark 14:68 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Pita gọrọ agọ sị ya, “Amaghị m, aghọtaghị m ihe ị na-ekwu.” Mgbe Pita na-ekwu okwu, o ji azụ azụ pụọ gaa guzo nꞌakụkụ ụzọ e si abata nꞌezi ụlọ ahụ.
Igbo 2006
Ma ọ gọrọ, si, Amataghm, aghọtaghm kwa ihe gi onwe-gi nēkwu: o we pua je n'uzọ-nbata.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ gọrọ agọ sị, “Amaghị m, maọbụ ghọtakwa ihe ị na-ekwu.” Ma ọ pụrụ gaa nʼụzọ e si abata. Mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa.