Mark 14:72 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌotu oge ahụ kwa, oke ọkụkọ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara ihe Jisọs gwara ya. Nꞌihi na Jisọs gwara ya sị, “Tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị ugboro atọ.” Mgbe Pita tụlere okwu ndị a nꞌobi ya, o bidoro ịkwa akwa.
Igbo 2006
Ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa ákwá nke ub͕ò abua. Pita we cheta okwu ahu, otú Jisus siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ub͕ò abua, i gāgọnarim ub͕ò atọ. Mb͕e ọ tulere okwu a n'obì o we kwa ákwá.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼotu oge ahụ, oke ọkụkụ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara okwu Jisọs gwara ya sị, “Tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Obi tiwara ya mee ka ọ kwaa akwa.