Mark 15:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌisi ụtụtụ ụbọchị nke ọzọ ya, ndị isi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu na ndị nile na-eso ha anọdụ nꞌụlọ ikpe ndị Juu zukọtara ikpebi ihe ọzọ ha ga-eme. Ha kpebiri iji ndị nche duru Jisọs jekwuru Paịlet, bụ onye na-achị obodo ndị Juu nꞌoge a.
Igbo 2006
Ngwa ngwa n'ututu ndi-isi-nchu-àjà, ha na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, na nnọkọ-ikpé dum, b͕ara ìzù, we ke Jisus ab͕u, kupu Ya je, rara Ya nye n'aka Pailat.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet.