Mark 15:29 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị mmadụ si nꞌebe ahụ ha kpọgidere ya nꞌobe gafee fufere isi ha na-akwa ya emu na-asị, “Leenụ ya ugbu a! Nke a bụ nwoke ahụ sị na ya ga-akwatụ ụlọ nsọ ukwu Chineke wụgharịa ya nꞌime ụbọchị atọ!
Igbo 2006
Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha, nāsi kwa, Ehe! Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị mmadụ si nʼebe ahụ gafee fufere isi ha na-ekwutọ ya, na-asị, “Leenụ gị! Onye ga-akwada ụlọnsọ ma wugharịa ya nʼabalị atọ.