Mark 15:32 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha tikuru Jisọs sị ya, “Bịa, Onye nzọpụta, eze Izirel, si nꞌelu obe ahụ rịdata! Anyị ga-ekwerekwa na ị bụ ihe nile i kwuru na ị bụ.” Ndị ahụ akpọgidekọrọ ha na Jisọs nꞌobe nọkwa na-abụ ya ọnụ.
Igbo 2006
Ka Kraist, Eze Israel, si n'elu obe ridata ub͕u a, ka ayi we hu kwere kwa. Ndi akpọgidere Ya na ha n'obe nāta kwa Ya uta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.