Mark 15:36 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere, otu onye nꞌime ha gbara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nꞌime mmanya gbara ụka, fanye ya nꞌogologo osisi, welie ya elu detụ ya nꞌọnụ Jisọs. Mgbe ọ na-eme nke a, ọ sịrị, “Ka anyị leenụ ma Ịlaịja ọ ga-abịa wetuo ya nꞌosisi a!”
Igbo 2006
Otù onye we b͕a ọsọ, were manya-vine b͕ara uka b͕aju sponge, tukwasi ya n'amì, nye Ya ka Ọ ṅua, si, Rapunu; ka ayi hu ma Elaija nābia iwedata Ya n'obe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, otu onye gbaara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nʼime mmanya gbara ụka, fanye ya na okporo osisi, nye ya ka ọ ṅụọ, ma na-asị, “Hapụnụ ya, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa tọtuo ya.”