Mark 15:46 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Josef zụtara akwa ọcha dị ogologo. O wedatara ahụ Jisọs, jiri akwa ọcha ahụ kee ya. Emesịa, o buuru ozu Jisọs buba ya nꞌime ili nke aka ya, nke o gwuru nꞌime nkume. Nꞌikpeazụ, o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ili ahụ.
Igbo 2006
O we zuta ezi ákwà ọcha; mb͕e o budatasiri Ya, o we ke Ya n'ezi ákwà ọcha ahu, tọb͕ọ Ya n'ílì nke egwuwarari n'oké nkume; o we kpọre otù nkume kwachie ọnu-uzọ ílì ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Josef zụtara akwa ọcha linin, wedata ahụ ya jiri akwa ahụ fụchie ya. O buuru ya buba ya nʼime ili nke o gwuru nʼime nkume. Emesịa o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ụzọ ili ahụ.