Mark 16:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ha, mgbe ha nile nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nꞌihi enweghị okwukwe ha, na nꞌihi na ha jụrụ ikwenye nꞌihe Meri na ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha banyere mbilite nꞌọnwụ ya.
Igbo 2006
Emesia emere ka Ọ puta ìhè nye ndi-ozi iri na otù onwe-ha mb͕e ha nọduru na nri; O we ta ekweghi-ekwe-ha na obi-etili-ha uta, n'ihi na ha ekweghi okwu ndi huru Ya mb͕e emesiri ka O si n'ọnwu bilie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ya, mgbe ha nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nʼihi enweghị okwukwe ha nakwa mkpọchi obi ha, nʼihi na ha jụrụ ikwenye nʼihe ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha mgbe e mesịrị ka ọ si nʼọnwụ bilite.