Mark 16:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Aka ha ka ha ga-eji tụtụlie agwọ, ma ọ gaghị ata ha. Ọ bụrụ na ha aṅụọ nsi, ọ gaghị egbu ha. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka nꞌahụ, mee ka ahụ dị ha mma.”
Igbo 2006
ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha aṅua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gaghi emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha ga-eji aka ha abụọ atụtụlie agwọ, ṅụọkwa nsi ma ọ gaghị emerụ ha ahụ ma otu. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka, ahụ ga-adịkwa ha mma.”