Mark 16:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya pụrụ kwusaa ozi ọma nꞌebe nile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha. O gosiri na okwu ha bụ eziokwu site nꞌinye ha ike ịrụ ọrụ ebube nke ya na nkwusa ozi ọma ahụ so.
Igbo 2006
Ndi ahu we pua, kwusa ebe nile, Onye-nwe-ayi nēso kwa ha n'ilu ọlu, nēme okwu-ha ka o guzosie ike site n'ihe-iriba-ama di iche iche nke nēso. Amen.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha pụrụ kwusaa oziọma nʼebe niile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha, mee ka okwu ya guzosie ike site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke na-eso ya.