Mark 16:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ụmụ nwanyị ahụ gbapụtara site nꞌili ahụ nꞌọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọ bụla ihe ọ bụla, nꞌihi na ụjọ jupụtara ha obi.
Igbo 2006
Ha we pua, si n'ílì ahu b͕alaga; n'ihi na ọma-jijiji na njubiga-anya-ókè nānwu ha n'aru: ha agwaghi kwa onye ọ bula ihe ọ bula; n'ihi na ha nātu egwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi. [Ọtụtụ akwụkwọ mbụ na ụfọdụ ndị mgbe ochie enweghị amaokwu itoolu ruo na nke iri abụọ 9–20.]