Mark 16:9 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụbọchị mbụ nꞌizu ụka, mgbe Jisọs si nꞌọnwụ bilie, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, nwanyị ahụ o sitere nꞌahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa.
Igbo 2006
Ma mb͕e O siri n'ọnwu bilie n'ututu n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, O buru uzọ were Onwe-ya gosi Meri Magdalini, onye Ọ chupururi mọ ọjọ asa nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs biliri nʼọnwụ nʼisi ụtụtụ nʼụbọchị mbụ nke izu, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, onye ahụ o siri nʼahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa.