Mark 2:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌabalị ahụ, Livayị kpọrọ Jisọs oriri nꞌụlọ ya. Ọ kpọkwara ọtụtụ ndị enyi ya, ndị ọnaụtụ dị ka ya onwe ya, na ọtụtụ ndị mmehie. Ha nile na Jisọs nọkọkwara nꞌotu tebulu na-eri nri. Ndị a ha na Jisọs na-erikọ nri bụkwa ụdị ndị na-esogharị ya ebe ọ bụla ọ na-ekwusa ozi ọma.
Igbo 2006
O rue, na Ọ nọduru na nri n'ulo-ya, ọtutu ndi ọna-utu na ndi-nmehie so-kwa-ra Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri: n'ihi na ha di ọtutu, ha nēso kwa Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ na-eri nri uhuruchi nʼụlọ Livayị, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie soro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ ebe ahụ, nʼihi na ndị na-esogharị ya dị ọtụtụ.