Mark 2:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ndị ozizi iwu na ndị Farisii hụrụ Jisọs ka o so ndị mmehie na ndị ọnaụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ Jisọs ajụjụ sị ha, “Gịnị mere nna unu ukwu ji eso ndị mmehie na ndị ọnaụtụ na-erikọ nri?”
Igbo 2006
Mb͕e ndi-ode-akwukwọ di n'etiti ndi-Farisi huru na O nēso ndi-nmehie na ndi-ọna-utu ahu eri ihe, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, Gini mere Ọ nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ahu eri ihe?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ndị ozizi iwu nke ndị Farisii hụrụ ya ka o so ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere o ji eso ndị mmehie na ndị ọna ụtụ na-erikọ nri?”