Mark 2:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs zara ha sị, “Ò ziri ezi ka ndị a kpọrọ oriri ọlụlụ di na nwụnye hapụ iri ihe mgbe di nwanyị nọ nꞌebe ahụ? Ya mere, mgbe di nwanyị nọ ya ibu ọnụ adịghị mkpa nꞌihi na ọ ga-enye ha ihe oriri.
Igbo 2006
Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru ibū ọnu mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ka oge ra ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ ha apughi ibū ọnu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs sịrị ha, “O kwesiri na ndị a kpọrọ oriri ọlụlụ di na nwunye ga-ebu ọnụ mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ nọ nʼetiti ha? Ha apụghị ibu ọnụ ogologo oge ya na ha nọ.