Mark 2:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu a kwa, ndị mmadụ adịghị etinye mmanya ọhụrụ dị ike nꞌime karama akpụkpọ ochie, nꞌihi na ike mmanya ọhụrụ a ga-eme ka karama akpụkpọ ochie ahụ gbawaa. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ọhụrụ.”
Igbo 2006
Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, manya-vine gāb͕awa karama-akpukpọ ahu, manya-vine na karama-akpukpọ ala kwa n'iyì: ma anāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dịghị onye na-agbanye mmanya ọhụrụ na karama akpụkpọ ochie. O mee nke a, mmanya ahụ ga-agbawa karama akpụkpọ ochie ahụ, mee ka karama na mmanya laa nʼiyi. Ee, a na-agbanye mmanya ọhụrụ nʼime karama akpụkpọ ọhụrụ.”