Mark 2:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌoge Abịata bụ onyeisi nchụaja Devidi na ndị so ya banyere nꞌụlọ nsọ Chineke. Nꞌebe ahụ ha tara beredi e chere nꞌihu Chineke. Ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ kwesịrị ịta beredi nsọ ahụ karịakwa ndị nchụaja. Ma Devidi banyere nꞌebe ahụ were ya taa, nyetụkwa ndị ya na ha so.”
Igbo 2006
Otú ọ batara n'ulo Chineke mb͕e Abaiata bu onye-isi-nchu-àjà, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka erie, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi, o we nye kwa ndi ya na ha yikọ?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge Abịata bụ onyeisi nchụaja, ọ banyere nʼụlọ Chineke taa achịcha e chere nʼihu ya, nke ziri ezi na ọ bụ naanị ndị nchụaja kwesiri ịta ya. O nyetụkwara ndị ya na ha so.”