Mark 2:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ha bịara nso ọnụ ụzọ ahụ, ha chọpụtara na ha enweghị ike isite na ya gafee, baa nꞌime ụlọ ahụ. Nꞌihi ya, ha rigooro elu ụlọ ahụ Jisọs nọ nꞌime ya, gwupuo elu ụlọ ahụ. Ha kenyere ụdọ dị ogologo nꞌute ahụ enyi ha dina nꞌime ya, sitekwa nꞌoghere ahụ ha mere wetuo ute ahu.
Igbo 2006
Mb͕e ha apughi ikuru ya biakute Ya n'ihi ìgwè madu, ha we kpupu elu ulo ebe Ọ nọ: mb͕e ha gwupusiri ya, ha we buda ute nke onye akuku-aru-ya nwuru anwu nēdina.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe ha na-enweghị ike ibutere ya Jisọs nʼihi igwe mmadụ, ha gwupuru oghere nʼelu ụlọ ebe ahụ ọ nọ. Mgbe ha gwupusiri ya, ha budatara onye ahụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nʼute o jiri dina.