Mark 3:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ọ bụla kwa ndị mmụọ ọjọọ na-achị hụrụ Jisọs ha na-ada nꞌala nꞌihu ya na-eti mkpu akwa na-asị, “Ị bụ Okpara Chineke!”
Igbo 2006
Ọzọ, mb͕e ọbula ndi-mọ nādighi ọcha lere Ya anya, ha nāda n'ala n'iru Ya, nēti nkpu, si, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọbụla kwa ndị mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ha hụrụ ya, ha na-ada nʼala nʼihu ya na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!”