Mark 3:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụfọdọ mmadụ nọ na-ele ya anya ịhụ ihe ọ ga-eme. Ha chọrọ ịmata ma Jisọs ọ ga-agwọ nwoke a nꞌụbọchị izuike. Ha na-echekwa ibo ya ebubo mmebi iwu maka edebeghị ụbọchị izuike nsọ.
Igbo 2006
Ha we nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n'ubọchi-izu-ike; ka ha we bo Ya ebubo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụfọdụ ha nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi boo ya ebubo, ya mere ha lekwasịrị ya anya ịhụ ma ọ ga-agwọ ya ọrịa nʼụbọchị izuike.