Mark 3:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe nwoke ahụ pụtara guzo ebe Jisọs ziri ya, Jisọs tụgharịrị jụọ ndị mmadụ ajụjụ sị, “Olee ihe unu chere bụ ihe dị mma? Ọ̀ bụ inyere mmadụ aka nꞌụbọchị izuike ka ọ bụ imerụ mmadụ ahụ? Ọ̀ bụ ịzọpụta mmadụ ka ọ bụ igbu ya?” O nweghị onye kwuru okwu nꞌetiti ndị ahụ nile.
Igbo 2006
O we si ha, Ò ziri ezi n'iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n'ubọchi-izu-ike? ìzọputa ndu, ma-ọbu ib͕u eb͕u? Ma ha kpuchiri ọnu-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ ọ jụrụ ha sị, “Olee nke ziri ezi nʼiwu ime nʼụbọchị izuike: ọ bụ ime ezi ihe ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ndụ nʼiyi?” Ma ha gbachiri nkịtị.