Mark 3:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs lere ha anya nꞌiwe. Enweghị ọmiko ha were ya iwe nke ukwuu. Mgbe ahụ ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ okwu sị, “Setipụ aka gị!” Nꞌotu mgbe ahụ nwoke ahụ setipụrụ aka ya. Mgbe ọ na-eme nke a aka ya dizikwara nke ọma.
Igbo 2006
Mb͕e O lesiri ha anya gburugburu n'iwe, ebe ọ nēwuta Ya nke-uku, bú na anēme ka obi-ha ma etili, O we si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di mbu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O lere ha anya nʼiwe, o wutere ya nʼihi na obi ha kpọrọ nkụ. Ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” O setịpụrụ aka ya, aka ya dizikwara nke ọma.