Mark 4:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọzọ kwa, Jisọs gara nꞌakụkụ osimiri Galili bido izi ihe. Ọtụtụ mmadụ gbakwara ya gburugburu. Nꞌihi nke a ọ banyere nꞌụgbọ mmiri ahụ.
Igbo 2006
Ọ we malite ọzọ izí ihe n'usọ oké osimiri. Oké ìgwè madu uku we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕o, we nọdu ala n'osimiri; ìgwè madu ahu nile we nọ n'usọ oké osimiri n'elu ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ọzọ, ọ malitere izi ihe nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ dị ukwuu gbara ya gburugburu, nke mere na ọ banyere nʼime ụgbọ nọdụ ala nʼime ya nʼelu mmiri ahụ, ma igwe mmadụ ahụ nọkwa nʼakụkụ osimiri ahụ.