Mark 4:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụ unu ka ọ dịrị ịmata ihe omimi nile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ, ndị na-anọghị nꞌebe a ugbu a, bụ ndị ga-anụ ha nꞌilu.
Igbo 2006
O we si ha, Ọ bu unu ka enyeworo ihe-omimi ala-eze Chineke: ma anēmere ndi nọ n'èzí ihe nile n'ilu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gwara ha sị, “Enyela unu ihe omimi nke alaeze Chineke. Ma ndị nọ nʼezi, a na-agwa ha ihe niile nʼilu,