Mark 4:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ndị ahụ ya na ha nọ ajụjụ sị, “Ọ bụrụ na o siiri unu ike ịghọta ilu ntakịrị a, unu ga-esikwanụ aṅaa ghọta okwu nile m na-aga ikwu nꞌoge dị nꞌihu?”
Igbo 2006
O we si ha, Ùnu amataghi ilu a? ùnu gēsi kwa aṅa mara ilum nile?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, ọ jụrụ ha sị, “Ọ bụ na unu aghọtaghị ilu a? Unu ga-esikwa aṅaa ghọta ilu ndị ọzọ?