Mark 4:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma okwu ahụ ha nụrụ adabanyeghị nke ọma nꞌala ala obi ha ọ dịghị anọgidekwa. Ya mere, mgbe nsogbu na mkpagbu bidoro nꞌihi ime ihe ahụ ha nụrụ na Chineke chọrọ ka ha mee, ha na-akwụsị.
Igbo 2006
ma ha enweghi nkpọrọgwu nime onwe-ha, kama ha nānọ nwa oge; emesia, mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ha ma n'ọnyà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha, ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ.