Mark 4:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Obi ụfọdụ dị ka ala ọma ahụ. Ndị a bụ ndị nụrụ ozi ọma ahụ, nabata ya nꞌobi ha. Ha na-eji okwu ha nụrụ rụpụta ezi ọrụ. Ụfọdụ na-amị iri mkpụrụ atọ, ndị ọzọ iri mkpụrụ isii, ndị ọzọ narị mkpụrụ karịa nke a kụrụ.”
Igbo 2006
Ndi ahu bu kwa ndi aghara n'ala ahu di nma; ndi ọ bula ndi nānu okwu ahu, we nara ya, we mia nkpuru, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị ọzọ, dị ka mkpụrụ a kụrụ nʼezi ala, nụrụ okwu ahụ, nabata ya ma mịa mkpụrụ dị iri atọ, iri isii, maọbụ otu narị.”