Mark 4:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ha sị, “Ò ziri ezi ịmụnye iheọkụ dọnye ya nꞌokpuru igbe, ma ọ bụ nꞌokpụrụ ihe ndina? É, è! Nꞌihi na ebe e kwesịrị ịdọba iheọkụ bụ nꞌelu tebulu.
Igbo 2006
O we si ha, Ànēbute oriọna ka adọba ya n'okpuru mb͕é', ma-ọbu n'okpuru ihe-ndina? ọ̀ bughi ka adọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “A na-ebute oriọna ka e jiri efere kpuchie ya maọbụ dọnye ya nʼokpuru akwa ndina? Ọ bụghị ka a dọba ya nʼelu ihe ịdọba iheọkụ?