Mark 4:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ gwakwara ha sị, “Kpacharanụ anya banyere ihe unu ji okwu unu na-anụ eme. Nꞌihi na ọ bụ ụzọ unu siri mesoo ndị mmadụ mmeso ka a ga-esi mesoo unu. Nꞌezie, mmeso Chineke ga-emeso unu ga-adị ukwuu karịa.
Igbo 2006
O we si ha, Lezienu anya ihe unu nānu: ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu: agēnye kari kwa unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “Kpacharanụ anya ihe unu na-anụ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu, maọbụ karịa.