Mark 4:32 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
ọ na-eto buo nnọọ ibu. Ọ na-enwe alaka dị ogologo. Ụmụ nnụnụ na-abịakwa wuo akwụ ha nꞌalaka ya.”
Igbo 2006
ma mb͕e ọ bula aghara ya, o tó, ghọ ihe bùkari ihe nile anāku n'ubi, o we waputa oké alaka; nke mere ka anu-ufe nile nke elu-igwe pu inọ n'okpuru ǹdò-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe a kụrụ ya, ọ na-eto bukarịa ihe niile a kụrụ nʼubi, ọ na-enwe alaka dị ukwuu nke bụ na ụmụ anụ ufe nke eluigwe na-ezukwa ike nʼokpuru ya.”