Mark 4:37 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ha nọ nꞌụzọ na-aga, oke ifufe dị ike bidoro ife. Ebili mmiri bidoro na-amagharị, mmiri bidokwara ịbanye nꞌime ụgbọ ha. Mmiri banyere nꞌụgbọ ha dị ukwuu ruo na ụgbọ ha chọrọ imikpu nꞌime mmiri.
Igbo 2006
Oké ajọ ifufe we fe, ebili-miri we nāwubà n'ub͕o ahu, ya mere na miri nēju n'ub͕ọ ub͕u a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya.