Mark 4:38 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ihe ndị a nile na-eme, Jisọs nọrị nꞌime ụgbọ ahụ na-arahụ ụra. O jiri akwa a fụkọtara afụkọta hinye nꞌisi ya. Ndị na-eso ụzọ ya tụrụ oke egwu mgbe ihe ndị a na-eme, gbaara ọsọ tie mkpu kpọtee ya, na-asị, “Nna anyị ukwu! Ọ dịghị emetụ gị nꞌobi na anyị nile ga-anwụ ma ụgbọ anyị mikpuo?”
Igbo 2006
Ma Ya onwe-ya nọ n'isi ub͕ọ, nāraru ura n'elu ohiri-isi: ha we kpọte Ya, Si Ya, Onye-ozizí, Ò metughi Gi n'obi na ayi nāla n'iyì?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Jisọs nọ nʼazụ azụ ụgbọ ahụ na-arahụ ụra nʼelu ohiri isi. Ndị na-eso ụzọ ya kpọtere ya sị ya, “Onye ozizi, o metụghị gị nʼobi na anyị nʼala nʼiyi?”