Mark 5:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs kwenyere ka ha banye nꞌime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ndị a bara nꞌime ezi ndị ahụ, igwe ezi ahụ nile ọnụ ọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nꞌime osimiri, ebe mmiri riri ha nile.
Igbo 2006
O we kwere ha. Ndi-mọ ahu nādighi ọcha we puta, je ba n'ìgwè ezì ahu: ìgwè ezì we nudà n'ebe ahu di nkputankpu dabà n'oké osimiri, ha ruru dika nnù ise; miri we b͕ab͕ue ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ hapụrụ ha; mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha pụtara baa nʼime igwe ezi ndị ahụ. Igwe ezi ahụ niile, ọnụọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nʼime osimiri ebe mmiri riri ha niile.