Mark 5:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị ahụ nọ mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ kọọrọ mmadụ nile ihe mere nwoke ahụ. Ha kọkwaara ha akụkọ banyere mmụọ ọjọọ ndị ahụ a chụpụrụ, na ihe mere igwe ezi ndị ahụ.
Igbo 2006
Ndi huru ya we kọrọ ha otú emere onye ahu ndi-mọ ọjọ ji, na okwu ìgwè ezì ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị hụrụ ihe mere kọọrọ ihe niile mere nwoke ahụ mmụọ ọjọọ bibu nʼime ya. Ha kọkwaara ihe mere igwe ezi ndị ahụ.