Mark 5:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu mgbe ahụ ha si nꞌime ụgbọ ha wụdata, onye buru ụzọ zute ha bụ nwoke mmụọ ọjọọ na-achị. O sitere nꞌebe a na-eli ozu pụta.
Igbo 2006
Mbe Ọ putasiri n'ub͕ọ, ngwa ngwa nwoke nke di n'aka mọ nādighi ọcha we si n'ebe anēlì ozu zute Ya,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs sitere nʼụgbọ ahụ pụta, otu nwoke mmụọ na-adịghị ọcha si nʼebe a na-eli ozu bịa zute ya.