Mark 5:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Jisọs rukwara nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ, igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu.
Igbo 2006
Mb͕e Jisus gasiri ọzọ n'ub͕ọ ahu n'ofè ọzọ, oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ: O we nọ n'usọ oké osimiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs jiri ụgbọ mmiri gafee nʼakụkụ nke ọzọ, ọtụtụ igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu mgbe ọ nọ nʼakụkụ osimiri.