Mark 5:30 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ahụ kwa Jisọs nꞌonwe ya matara na ike esitela ya nꞌahụ pụọ. Ọ tụgharịrị jụọ ajụjụ sị, “Ònye metụrụ uwe m aka?”
Igbo 2006
Ngwa ngwa, ebe Jisus mazuru na ike nke nēsi nime Ya puta apuwori, O chigharia n'ìgwè madu ahu, we si, Ònye meturu uwem aka?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼotu oge ahụ Jisọs matara na ike esitela ya nʼahụ pụọ. Ọ tụgharịrị gburugburu nʼetiti igwe mmadụ ahụ jụọ sị, “Onye metụrụ uwe m aka?”