Mark 5:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs nọ na-agwa nwanyị ahụ okwu, ndị ozi sitere nꞌụlọ Jaịrọs bịarute. Ha gwara Jaịrọs okwu sị, “Enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ, nꞌihi na ada gị anwụọla.”
Igbo 2006
Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, ha si n'ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwanyi anwuruwo: gini mere i nēsob͕u Onye-ozizí a ọzọ kwa?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, ụfọdụ ndị mmadụ sitere nʼụlọ onyeisi ụlọ ekpere bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, olee ihe mere i ji esogbu onye ozizi a ọzọ?”