Mark 5:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na mgbe ọ bụla e kere ụkwụ na aka ya, ọ na-adọbisi eriri e ji kee ya. Ọ na-akpakwa ike nke ukwuu.
Igbo 2006
n'ihi na ewereri nkpọrọ-ukwu na nkpọrọ ke ya ọtutu mb͕e, o we nyajipusia nkpọrọ nile, kujisia nkpọrọ-ukwu nile: ọ dighi kwa onye ọ bula di ike imeju ya anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na e keela ya agbụ ụkwụ nʼaka ọtụtụ oge ma ọ dọbisiri eriri igwe ndị ahụ, gbajisiekwa mkpọrọ igwe dị ya nʼụkwụ. Ọ dịkwaghị onye nwere ike ijideli ya.